ATUMATUOKWU (FIGURES OF SPEECH)
Atumatuokwu bu nka di iche ndi gibo ji acho okwu na edemede ha mma. Mgbe o bula a na- ekwu maka atumatuokwu, ihe a na- ekwu maka ya bu okwu nka di iche iche n’ asusu Igbo.
A bia n’ edemende/agumagu, a na – enwe okwu nka di iche iche e ji acho yam ma. N’ ihi nke a, onye o bula choro ka okwu ufodu ma o bu edemede ya dim ma ga – agba mbo muta atumatuokwu digasi iche iche.
ATUMATUOKWU UFODU E NWERE N’ ASUSU IGBO GUNYERE:-
1. Mburu (Metaphor)
2. Myiri (simile)
3. Nsinuda (Onamatopia)
4. Mmemmadu (personification)
5. Nkwusara (apostrophe)
6. Uraokwu (pun)
7. Ekwuecheozo/Ogharaokwu (Irony)
8. Egbeokwu (Hyperbole)
9. Ajujunzaraonwe (rhetorical question)
10. Igbuduokwu (paradox)
11. Nhagideokwu (Antithesis)
12. Biambiammgbochi (Alliteration)
13. Akpuokwu (Epigram)
14. Nkwuma (Euphemism)
15. Ahaonochi (Mitonymy) dgz
• Mburu (Metaphor):- Mburu bu atumatuokwu e nwere n’ asus igbo nke na- akowa na ihe a na- ekwu maka ya bu ihe ahu kpomkwem. Mburu anoghi na ntunyere, nke a putara na mburu anaghi akowa na ihe ahu dika kama na ihe ahu bu. Mkpuruokwu e jikwanu ama mburu n’ ahiriokwu bu mkpuruokwu a “BU”.
Omumatu:
Mburu Nkowa Mburu
1 Ebere bu azu na mmiri Ebere maara egwu mmiri nke oma.
2 Nwannyi ahu bu usu Nwanyi ahu joro njo nke ukwu
3 Ekene bu mbe Ekene na-agho aghugho nke ukwu
4 Nwafo bu ezi Nwafor na- eru ezigbo inyi. On naghi adi ocha.
5 Adaku bu edi Adaku na-arahu oke ura
6 Nwata ahu bu aturu Nwata ahu na-ezuzu ezuzu. dgz
• MYIRI: Myiri bu otu n’ ime atumatuokwu e nwere n’ asusu igbo nke na-egosiputa na ihe yiri ibe ya, na ihe dika ibe ya mana o nughi na ihe abuo ahu e ji atunyere ibe ha bu otu pkomkwem.
Okwu e ji enweta myiri n’ asusu igbo bu DIKA ma o bu KA.
Omumatu:
i. Emeka na-agba oso ka agwo
ii. Onwuzuruike na- ari elu ka enwe
iii. Nweke na- alu ogu ka agu
iv. Nwoke ahu dika usu
v. Ikem na-ebe akwa ka ehi dgz.
• NSINUDA: Nsinuda bu atumatuokwu e si n’ uda ihe dara were na-enweta. Ihe o bula mmadu mere ma o bula merenu uda e sin a ya puta ka a na- akpo nsinuda/udauda.
Omumatu:
a. Asha na – akpo chiki chiki n’ elu osisi ahu.
b. Ndi abalidiegwu na – esu dumdumdum n’ uzo.
c. Egbe agbara dara gbim n’ elu ulo
d. Akpukpoukwu ya na – ada ka koi n’ ala.
e. O na – agba uja wom wom ka nkita. Dgz.
• MMEMMADU: Mmemmadu bu atumatuokwu nke na – eziputa ihe adighi ndu dika mmadu. Na mmemmadu, a na – agwa ihe anaghi eku ume ma o bu ihe a naghi ahu anya okwu o dika o bu mmadu.
i. Ube m rachara maram ura.
ii. Aguu gworo anyi iba unuahu.
iii. Okochi egbuchaala ihe anyi koro n’ ubi.
iv. Onwa na – azacha ala ugbu a.
v. Oyi jisiri nwa ahu ike. Dgz.
• NKWUSARA: Nkwusara bu atumatuokwu na – ekwuru onye a noghi ya, ihe a naghi ahu anya, ma o bu onye nwuru anwu ka a ga – asi a na – ekwu no ebe ahu mgbe ahu a na – ekwu ya ma o bu na ihe a na – agwa na – anu ihe a na – ekwu.
Omumatu:
i. Oku a, gini mere I ji nyuo.
ii. Onwu, olee ebe ike gi di?
iii. Mmiri a biko amala m dgz.
• OGHARAOKWU/EKWUECHEOZO: Ogharaokwu/Ekwuecheozo bu atumatuokwu na – egosiputa na mmadu bu ihe ozo. O na – abu okwu a na – abu ekwuohaa nghoto ya ahapu otu ahu e siri kwuo ya tugharia na – akowa ihe ozo.
Omumatu:
a. Nneka degburu mmadu n’ ule ahu-
i. ihe nke a putara na Nnke detere ihe nke ukwuu n’ ule e lere.o putaghi na Nneka ji ihe degbuo mmadu.
ii. Amaka amagbola onwe ya n’ akwukwo.
iii. Nkechi na – agbagbu onwe ya n’ oso dgz.
• NHAGIDEOKWU: A na – eji atumatuokwu a egosiputa okwu abuo na – aru onweha uka. Omumatu
a. Udemba bu aru a na- agba egbe o na – ata nri.
b. O naghi ezu ohi mana o gafee ihe efuo.
c. Chineke bu o no nso erughi aka.
d. O bu odi mfe anyi aro. Dgz
• AHAONOCHI: Ahaonochi bu atumatuokwu ndi igbo ji edochi aha ihe, o bu okwu ha ji eto mmadu site n’ udi akparamagwa onye ahu, odidi onye ahu,na igba mbo ya.
Omumatu:
i. Onwa na – etiri oha.
ii. O chiri o zuo.
iii. Ukpaka gbagburu enyi.
iv. Omapru onye o diri. Dgz
• EGBEOKWU: Egbeokwu bu atumatuokwu e ji ama atu ihe mana ihe ahu a na – ama atu ya a naghi aharu ka ihe e ji ama atu ya n’ egbeokwu, a na- akpanye nnu n’ ihe mee ka o daa uda.
Omumatu:
a. Ndi biara agbamankwu m di ka aja di n’ ala.
b. Afo ya ha ka ite mmiri.
c. Isi nwata ahu ha ka isi ukwa.
d. Adaora mara mma na-ese okwu.
e. Eze di nwannyi ahu n’ onu hacha ka ogu dgz.
• AKPUOKWU: Akpuokwu by atumatuokwu nke o bun a o buru na icheghi echiche nke oma I gaghi aghota ya site n’ ile ya anya n’ elu n’ elu nghoto ya na- ebute ihe ochi.
Omumatu:
a. O bu ikechukwu ji nna ya ndu.
b. Ezinaulo ahu rir nri bu nwatakiri ahu dgz.
CHOPUTA MAKA ATUMATUOKWU NDI OZO MA GUO HA NKE OMA
AJUJU:
1. Kowaa ihe bu atumatu okwu.
2. Kpoputa udi atumatuokwu ise I maara.
3. Kowaputa ihe atumatuokwu ndi a putara.
i. Nkechi bu mbe.
ii. Agnes na- eji ka unyi.
iii. Okafor na – eme ka aturu.
OLUNDI NA IGBO IZUGBE - (Guo nootu gin a taam nke abuo maka isiokwu a)
EDEMEDE LETA ANAMACHOIHE
Leta Anamachoihe bu udiri leta a na- ede maka achomoru, mkpesa, mgbazinye ego, mbuli n’ okwa, nnoghari onodu dgz. Leta achomihe bu udiri leta anaghi enwe ohere maka ihe na – agbasaghi isiokwu o na – ako naani ihe bu mkpa ya, malite n’ isi mbido ya were ruo n’ njedebe ya.
Leta Anamachoihe na – enwe adreesi abuo. Otu adreesi na – abu nke onye na –ede leta ahu, ga – adi na mkpaghara aka nri, n’ elu akwukwo e ji ede leta ahu adreesi ozo ga – esote ga – abu nke ga – abia na mpaghara aka ekpe. Na mgbadata, o buru na edechaa adreesi abuo ndi ahu, ihe ozo ga – eso ya bu otutu aha onye a na – edegara leta ahu dika. Nna m ukwu, E tuchaa aha, e deputazie ihe bu bu isiokwu e ji maka ya were debe leta ahu. E decha nkea, kaa ya ihe n ‘ okpuru, a ga amalitezi debezie ihe a choro ide na leta ahu. E dechazie ihe ndi e jiri maka ya wereedebe leta ahu, e mechie leta a na – ede. A naghi ede leta anamachihe ka o too oke ogologo. Ihe ndi a na- ede nay a anaghi ebu ibu. O bughi leta ekele. O nweghi ohere maka kedu maka onye a na onye,Na nchikota leta anamachoihe na – agbaso uroso a:
a. Adreesi ode leta.
b. Adreesi onye a na - edegara leta.
c. Itu aha: Omumatu “Nna m ukwu”.
d. Isiokwu ihe a na – edemaka ya
e. Ahu leta.
f. Mmechi leta anamachoihe.
Omumatu: leta anamachoihe
Dee oru na – ahu maka ndi koleji n’ Anambra Steeti rio ka ha were gi ikuzi igbo na koleji n’ Anambra steeti.
Tansi International College,
P.M.B. 6025,
Awka South Local Government Area,
Anambra State.
5th June, 2020
The Chairman,
Post Primary Schools Management Board,
Awka Road,
Onitsha.
Anambra State.
Onye Isi,
LETA MAKA INWETE ORU NKUZI
Leta a bu iji rio gi ma I ga – enwere m n’ oru nkuzi n’ uloakwukwo koleji Anambra Steeti. Agutara m n’ akwukwo akuko Vanguard nke June 5 na ohere dim aka nke a.
Aguru m akwukwo n’ ulo akwukwo Alvan Ikoku College of Education, Owerri bu uloakwukwo na – ewu ewu n’ izuputa ndi nkuzi bu akwaa akwuru n’ oru nkuzi. Ihe m guru bu Igbo na Bekee. Etutere m ugo N.C.E. N’ ogo nke karichasiri elu.
Agukwara m akwukwo na mahadum Naijiria di na Nsuka ebe m nokwa tute ugo DIGIRII n’ Igbo n’okwa nke mbu kwa. Efeela m ala Naijiria. Ebe m no mee nke a bun a Owerri Girls College, Imo State.
A kuziri anyi ogbara ohuru eji akuzi Igbo ka o banye umu akwukwo n’ uburu. Enwere m olile anya na o buru na I wee m, m ga – enye umu akwukwo m ihe ndi ahu n’ule a kuziri m.
Ana m atapanye foto asambodo m niile na m nke m ji fee ala Niajiria ga- egosikwa ndi ezie mgbe o bula achoro ha.
Abum,
okeke
Okeke Uchenna
LETA NKEONYE
Leta nkeonye bu udi leta enyi na edegara enyi ya, nwa na – edegara nna ya ma o bu nne ya, ikwu na – edegara ibe ya, nne na nna na – edegara umu ha. Dgz
A bia n’ udi leta a, e nwere usoro e si ede ya, usoro a gunyere.
a. Out adreesi
b. Itu aha/ekele
c. Ahu edemede leta
d. Mmechi leta.
a. Otu adreesi: Otu adreesi ka leta nkeonye na – ebu. Adreesi ahu ga – adi na mpaghara aka nri n’ elu akwukwo, I ji ede leta ahu
b. Itu aha/ekele: A bia na leta nkeonye, a na – etu onye a na – edegara leta aha dika: Ezigbo enyi m, Ezigbo nnem, Nwanne m oma, Ada anyi. Dgz
c. Ahu leta: Nke a bu ebe ode leta ga – akowaputa nke oma ihe o ochor idem aka ya na leta ahu.
d. Mmechi leta: O buru na ode leta dechazie, o ga – akowaputa onye o bu site n’ ide aha ya.
Omumatu:
Degara nna gi bi b’ Aba leta rio ya maka ihe ufodu di gi mkpa.
Tansi International College
P.M.B. 6025,
Awka South Local Government Area,
Anambra State
17th May, 2012
Ezigbo Nna m,
kedu ka I mere? Kedu maka nne m na umunne m? Ama m n’ ahu dicha ha nke oma. O buru etu ahu, ekele diri chukwu maka olu oma ya n’ ebe anyi no.
leta nke a bu iji kosara gi ufogu mkpa ndi m nwere n’ uloakwukwo anyi n’ oge ugbu a. ama m na o ga – ato gi uto n’ obi inuta na m akwuola ugwo akwukwo nke tam a, ekweghi m ka ndi ohi zuo ya etu ha siri zuo nke tam gara aga. Mkpa ndinna- eche gi n’ ihu gi ugbu a bu.
A si na nwata akwuokwo o bula ga – atu nari naira ise iji wee si ndi nke ga – apu n’ uloakwukwo n’ ajo, gaa nke oma. Mmemme ahu ga adi ma onwa Jualai gbaa mkpuru ubochi iri na ise. Ejikwa m ohere a na- asi ka I soro bia nonyere anyi.
O nwere akwukwo Igbo nke putara ohuru. A kporo ya Igbo maka Sinio Sekondiri (ogbara ohuru ya) akwukwo a dibu adi mana e deghariri ya ma weputa ya n’ udi enweghi atu. Nna m o ga – ato m uto ma odi n’ oba akwukwo m, e kwubeghi ego ole a na- ere ya mana ama m na o gaghi agafe nari naira isii. I ma – ala na ejighi m akwukwo m egwu egwu. M ga agu akwukwo a nke oma ma m zuta ya.
Nke ikpeazu bu igwa gi ka I cheta wetara m akpukpo ukwu m ji aga uka nke m chezuru n’ ime ulo ndina anyi.
Nna m, ewekwala iwe na m na – ario gi ego ugbu a uko ego di nnukwu n’ ihe na akwubeghi ndi oru ugwo. O bu etu o si di m na mkpa butere ya.
Kelee nne m na umunne m ndi ozo.
Abu m,
Nwa gi,
Nkechi.
AJUJU:
1. Kpoputa udi ato ndi e nwere n’ asusu Igbo.
2. Deputa ihe ato e ji mara leta nkeonye.
3. Degara nna gi bi n’ Aba leta, rio ya ka o wetere gi akwukwo ndi I choro n’ ulo akwukwo.
NTUGHARI
Ntughari bu I si n’ asusu okwu no na ya were weta okwu ahun’ asusu ozo n’ agbanyeghi nghoto okwu ahu. I si n’ asusu weta okwu were wefee ya n’ asus ozo anaghi eme ka nghota di n’ okwu ahu gbanwoo, naani ihe na – agbanwe bu asusu e ji mee ntughari a.
Ntughari kwesiri ka e meta ya nke oma n’ ihi na ntughari a na – emetaghi nke oma nwere ike bute ogbaghara, agha ma o bu nnukwu nsogbu n’ obodo, ihe nke a putara buna na tupu mmadu emee ntughari, o ga – eji ihe ndi a mee ihe
MGBAKWASA UKWU:
a. I ga – ama asusu ndi I na – eme ntughari na ha tupu I mebe.
b. I ga – agu ma ghotakwa nke oma okwu e nyere gi tugharia tupu I malite tughariwa ya.
c. A na – eji ilu atugham ilu, a naghi eji mkpuruokwu eme ya.
d. Onye na – eme ntughari kwesikwara ima nke oma ihe banyere akaraedemede, akaraajuju, nka okwu di iche iche, n’ ihi na ihe ndi a ga – enye aka n’ ime ntughari.
Omumatu:
NTUGHARI E SITERE NA BEKEE WERE AGAFEE N’ ASUSU IGBO.
BEKEE IGBO
1 Okeke is a son of the soil Okeke bu nwaafo
2 He did not take his breakfast before traveling O righi nri ututu ya tupu o gawa njem
3 A stitch in time saves nine E mee ngwa ngwa emeghara odachi
3 There is no smoke without fire Awo anaghi agba oso ehihe n’ efu
4 She came on foot O ji ukwu bia
5 All eyes were on him Anya niile di ya n’ ahu
6 You will be remembered your traveling expenses A ga – akwughachi gi ego i mefuru na njem ahu
7 How can he confront this stream of people? Kedu ka o ga esi gakwuru igwe mmadu ndi a?
8 Azu’s knowledge of that topic is very shallow Oihe Azu maara banyere isiokwu ahu ezughi oke
9 He slept in the Lord O nwuru n’ ime onyewannyi. Dgz
EDEMEDE NA UDI YA DI ICHE ICHE
Edemede bu otu n’ ime okpurukpu ihe ndi na – aputara umu akwukwo n’ ule asusu Igbo mgbe o bula.
Nwata akwukwo o bula choro ibu akwaa akwuru n’ edemede asusu Igbo ga – agba mbo muta ihe ndi a nke oma.
a. Nkejiasusu Igbo di iche iche.
b. Akaraedemede e nwegachara n’ igbo.
c. Nkaokwu di iche iche dgz.
O buru na I marachaa ihe ndi a nke oma ide edemede Igbo ga na – adiri gi mfe n’ ide. O bu ihe ndia ga – eme ka edemede I dere di uto ma kwere ogugu.
Akaraedemede di mkpa n’ edemede n’ ihi na o bu site n’ akaraedemede gi ka onye I na – etinye n’ edemede gi ka onye na – agu ya ga – eji mara ihe I na – ede ede, mara mgbe I jiri si ya gbawa ma o buy a kwuru.
Nka okwu dim ma iji ede edemede n’ihi na o buy a ka ndi Igbo ji acho edemede mma, o buru na mwatakiri na – ede edemede, na – etinye nka okwu dabara adaba na – ebe o dabara, o na – egisputana nwatakiriahu a marala asusu o ji ede edemede ya nke oma. Ihe ozo di mkpa bun a o buru na I maghi ebe okwu nka o bula kwesiri I daba, e tinyekwele ya n’ ihi na I mee ya, o ga – emebiri gi edemede ahu.
Mgbe o bula I dechara edemede gi, kjisie ike gugharia ihe ahu I dere ka I were nwee ike degharichaa ndehie niile din a ya bu edemede.
E nwere otutu edemede di iche iche n’ asusu Igbo ha bu ndia:
i. Edemede akomako (Narrative Essay)
ii. Edemede nkowasi (descriptive essay)
iii. Edemede ilu (expansion of proverb)
iv. Edemede nkowani (expository essay)
v. Edemede mgbagha/nruritauka (debate/argumentative essay)
vi. Edemede mkparitauka (dialogue)
vii. Edemede ekwumekwu (address)
viii. Edemede leta.
EDEMEDE AKOMAKO: Edemede akomako bu udi edemede e ji egosiputa ihe mere mgbe gara aga.
Omumatu:
a. “Ubochi oku bara ahia obodo m”
b. Ubochi m agaghi echefu na ndu m. dgz
EDEMEDE NKOWASI: N’ udi edemede a, a na – akowa ihe a na – ede maka ya nke om.
Omumatu: “Etu e si emeputa akara”.
“Etu e si ukwa” dgz
EDEMEDE ILU: Edemede ilu bu edemede a na – e ji ikowa ilu bido ma nwere akuko dabara adaba ji kwado ilu ahu nke o ga – abu mgbe I kochara akuko ahu ya na ilu ahu adaba nke oma.
Omumatu: “Onye ndidi na - eri”
“Azu ukpoo”
EDEMEDE NKOWAMI: n’ udi edemede a, ode na – eziputa ihe dum o nwere ike iji kowanne ihe di iche iche o mara maka ihe o na – ede maka ya.
Omumatu: Ihe a ga – eme iji beleta ihe mberede okporouzo n’ ala anyi.
EDEMEDE MGBAGHA/NRURITAUKA: Udi edemede a na – egosiputa mgbagha e nwere n’ etiti otu abuo nke odee na – enwere onwe ya diak onye na – ekwuchitere otu o no nay a okwu. Na mmalite nruritauka, a na – ebu uzo kelee onye isi oche, ndi so na muritauka na ohana eze na – ege nti.
Omumatu:
a. “Umunwaanyi igu akwukwo dim ma karia umunwoke”.
b. Ogwu Igbo na – agwo oria karia ogwu bekee”.
EDEMEDE MKPARITA UKA: Edemede mkparitauka bu edemede na – adi n’ udi onye kwuo, ibe ya asaa ya ihe o kwuru, tupu ede edemede a nke oma, a na edeputa aha mmadu abuo ga – akparitauka dika.
UCHE :
AGNES:
N’ ebe a, Uche ga – ekwu, Agnes asaa ya ma o bu Agnes kwuo, udi asaa ya. A na – enwe ekele na ebido ya dika I saalachi, kedu ka I mere, ndewo dgz. A na – ne jikwa ekele emechi ya dika gaa nke oma, kelechara m ndi ulo unu, ka o di n’ ubochi ozo dgz.
Na nchikota¸edemede di mkpa n’ ule o bula a na – ede n’ asus Igbo ya mere, nke o bula I na ede dee ya bke oma iji mwata ihe a choro ka I mee.
AJUJU:
1. Gini bu edemede?
2. Kpoputa udi edemede ano I maara.
3. Kowaa usoro e si ede edemede mkparitauka.
ORUAKA NDI IGBO
Ndi Igbo bu ndi e ji igba mbo mara n’ uwa niile. Ha nwere oru di iche iche ha na – aru. Ndi Igbo abughi ndi e ji irio aririo wee mara. Nke a mere ezigbo nwaafo Igbo obula ji agba mbo hu na o nwere akaoru. Ndi Igbo na – ako onye na – e nweghi ihe o na- aru onu, ha na – were ya ka onye umengwu. Ufodu akaoru ndi Igbo gunyere:-
a. Oruugbo:- Ndi Igbo bu ndi e ji ikpoputa ihe n’ ala mara, ha na – akoputa Ji, Akpu, Ede Ona, Osikapa, Akidi, Egwusi, na akwukwo nri di iche iche dgz. N’ ala Igbo, obodo Anam, Ogbaru, Abakiliki, Aguleri, Afikpo na obodondi ozo mmiri didebere nso na – akoputa ji.
b. Ikpa umuanumanu:- Otutu ndi Igbo bu ndi ji ikpa umuanumanu mere akaoru, ha na – akpa ehi, ewu, ezi, okuko na aturu dgz.
c. Iku Azu:- N’ ala Igbo, e nwere ndi e ji iku azu mara. Otutu ndi bi n’ akuku mmiri n’ ala Igbo ji iku azu mere akaoru.
d. Ichu Nta:- Ichu nta bu akaoru ozo e ji mara ndi Igbo. Ndi Igbo ji ichu nta mere akaoru na – ano n’ ime ohia n’ ututu, ehihie na abali na – achu anu ma na – egbu nta bum ma, egbe, uta dgz. Ndi na – achu nta na – e dukwa nkita achu ya.
e. Ite Mmanya:- N’ ala Igbo e ji ite mmanye mere akaoru, ndi ji ite mmanya mere akaoru n’ ala Igbo na – eriju afo ma nurukwaa ogaranya.
f. Azumahia: Ndi Igbo bu ndi e ji izu ahia mara. Azumahia e meela ka otutu ndi Igbo buru ogaraya ma burukwa ndi a na – anu aha ha n’ uwa niile.
g. Nkanauzu:- Ndi Igbo nwere ihe ndi ha ji mere nkanuzu ihe ndi ahu bu.
i. Itu ihe otutu ma obu ipi ihe dika ikwe, okwa eku na egbe, ha na – atuputa oche, mgbo dgz.
ii. Ikpu ihe okpukpu dika ite, ogu , mma ogele dgz. E ji ikpu uzu wee mara ndi Oka na Nkwere ebe e ji ikpu it euro were mara ndi Anamm na ndi igboukwu.
h. Ime Dibia:- Ihe gbasara ime dibia odinaala/omemaala bu otu n’ ime ihe ndi Igbo jiri mere akaoru. Oru dibia e meela ka otut ndi Igbo na – aru ya buru ogarany ma burukwa ndi aha ha na – ewu na mba niile.
URU ORUAKA BARA NA NDU NDI IGBO
Ndi Igbo sin a o bu ihe onye na – eme ka ekwe na – akpo ya. O bu ihe onye na – aru ka e ji mara ya n’ ala Igbo. Otutu mgbe, ndi Igbo na – etu mmadu aha site n’ udi ihe o na – aru, ufodu ka a na – akpo Diji, n’ ihi otutu ji o koputara na ndu, ufodu na – aza Ogbuagu, dgz. Ihe nke a putara bun a uru di n; inwe akaoru, uru ndi a gunyere.
1. Akaoru na – eme ika mmadu nweta ego n’ uzo ziri ezi.
2. Akaoru na – eme ka mmadu nwee ugwu na nsopuru.
3. Site n’ akaoru, mmadu nwere ike nwete mbuli elu n’ okwu.
4. Akaoru na – enye obi anuri.
5. Akaoru na – enye aka I mata obodo nke oma.
6. Akaoru na – eme ka obodo na – eto eto dgz.
AJUJU:
1. Kowaa n’ uju ihe bu akaoru.
2. Deputa udi akaoru ano e ji mara ndi Igbo.
AKARAEDEMEDE
Akaraedemede bu akara di iche iche a na – etinye n’ ihe e dere ede iji ziputa mkpoputa, uda, oru na nghota ya n’ uzo doro anya.
Akaraedemede bu akara ndi na – eme ka ihe e dere ede nwee nghota ma daba na mbunuche onye na – ede ya. O na – eme ka ihe mmadu dere nwee usoro dim ma. Hinye akaraedemede dika ha kwesiri di nnukwu mkpa iji mee ka a ghara inwe nghotahie n’ ihe e dere. Akaraedemede e nwere n’ asusu Igbo gunyere:-
1. Kpom (.) (fullstop)
2. Rikom (,) (comma)
3. Kpom kpom (:) (colon)
4. Kpomrikom (;) (semi colon)
5. Akaraajuju (?) Question mark)
6. Akaramkpi (!) Exclamation mark
7. Rikomelu (‘) Apostrophe
8. Akarauhia (-) Hyphen
9. Rikomngwu/Akarangwu (“ “) Quotation mark
10. Akara mgbodo/Ngudo ( ( ) ) Bracket
11. Akaraudaolu (‘ / -) Tone mark
12. Akara mmagha ( ^) omission dgz
EBE A NA – ETINYE NA OTU E SI ETINYE AKARAEDEMEDE DI ICHE ICHE
1. KPOM (.): Kpom bu ntupo a na – etinye iji gosi nkwusi ahiriokwu nke na abughi mkpu ma obu ajuju.
Omumatu:
a. Obi na - aga ahia
b. Eze kunyere mmiri.
c. Mmiri na – ezo n’ udummiri. Dgz
A na – etinyekwa kpom n’ aha mkpirisi ma obu iji gosi okwu a na – ederughi n’ isi. Omumatu:
Mz. = Maazi
Ork. = Oriaku
Dkt. Dokita. Dgz
2. RIKOM (‘): Rikom bu akaraedemede e ji egosi nkurume tupu ekwutopu ihe a na – ekwu. O na – egosiputa nkwusi pere mpe n’ ahiriokwu maobu n’ usorookwu.
Omumatu:
i. E ruo onicha, a ga – ahu osimiri Naija.
ii. Anyi gara ahia, ma anyi ahughi nnu na ose.
ii. Nnem zutara ji, ede, mmanu, nnu, azu na ogiri mgbe o jere ahi dgz.
3. KPOM KPOM (:): A na – etinye kpom kpom iji gosi ebe e nwere obere nkwusi tupu a gusiputawa ihe ndi ozo maobu tupu e deputa ihe e nwere olileanya maka ya.
Omumatu:
i. Ndi gara ahia bu ndi a: Ngozi, Ego, Chinwe, Nkechi na otutu umuagbogho ndi ozo.
ii. Ihe nyiri nwoke na nwaanyi bu: itute onye nwuru anwu. Dgz.
4. KPOMRIKOM (;): E ji kpomrikom egosiputa ebe okuku ume toturu eto. E ji ya ekewa ahiriokwu abuo abuo zuru ezu ma ha enwghi njiko n’ etiti ha.
Omumatu:
i. A hu e kwughi na – egbu okenye; e kwuo a nughi na – egbu nwata.
ii. O muru nwa; nwoke ka o muru.
ii. Ahu adighi ya; o gawala uloogwu.
5. AKARAAJUJU (?): E ji akaraajuju egosi nkwusi ebe a juru ajuju. O buru n’ akaraajuju a dighi n’ ahiriokwu ajuju, I mara na ahiriokwu ahu abughi ajuju na o bu okwu. Nkiti ka a na – ekwu.
Omumatu:
i. Gini mere o ji ebe akwa?
ii. Kedu nke bu ulo unu?
iii. Onye mutara nwa ocha? Dgz
6. AKARAMKPU (!): A na – etinye akara-Mkpu iji gosi ihe e ji iti mkpu kwuputa di ka okwu dapuru mmadu n’ onu na mberede site n’ ihe mere n’ ike. O nwere ite buru ihe oma maobu ihe ojoo.
Omumatu:
i. chei ! Onwu di egwu.
ii. Hei! Nwaanyi ahu a muola ejima.
iii. Ewoo! O biara. dgz
7. RIKOM ELU (N’): Ebe a na – etinye rikomelu n’ odide Igbo bu naani ebe “na” na – aru oru ka mbuuzo nke okwu na – eso ya ji udaume malite. E wepu nke a o nweghi zi ebe ozo a na – etinye rikomelu.
Omumatu:
i. Anyi bi n’ ulo elu.
ii. Ahuru m ya n’ uzo iyi.
iii. O zutara akwukwo n’ ahia orie dgz.
8. AKARAUHIE (-) N’: odide Igbo, ebe a na – etinye akarauhie bu naani ebe a choro izuputa nnyemakangwaa. A na – etinye akarauhie iji jikota nnyemakangwaa and mmekangwaa o na – enyere aka.
Omumatu:
i. Obi na – aza ulo.
ii. Chinecherem na – asa efere.
iii. Ogechi na – agba oso. Dgz
9. RIKOM NGWU (“ “): Rikom Ngwu bu nkom a kpogharir ihu nke a na – etinye n’ elu, na mbido na n’ isi ngwucha okwu e dere ka onye kwuru ya si kwuo ya n’ enweghi ihe a gbanwere.
Omumatu:
i. Onyenkuzi siri “Meenu ihe omume unu”.
ii. Nnem tiri mkpu si “Ekwukwala ozo” dgz.
10. AKARA MMAGHA (^): Akara mmagha bu akara a na – etinye n’ onodu ebe a maghara ihe n’ edered. A na – edeputa ihe ahu a maghara n’ elu ebe e tinyere akara mmagha ahu.
Omumatu:
a. O di ^ ka ndi Igbo mata ka e si ede asusu Igbo
b. O ^ mmiri n’ isi ututu taa. Dgz
11. AKARA NGUDO ( ): Akara ngudo na – eme ka amata ihe mere eme n’ ime ederede a na – agu nke e nweghi ike ikowaputa maobu ihe a choro ka e nye nkowa puru iche maka ya dika.
i. Ufodu umunna (ndi guru akwukwo) so bia.
ii. Ubochi ano ndi a (Eke, Orie, Afo, Nkwo) bugasi ubochi aha n’ Igbo.
iii. Mmemme Ekeresimeesi (Oriri maka omumu krist) na – ejuputa n’ onu. A na – ejikwa akara mgbodo/ngudo egbodo asusu ozo e jiri kowaa ihe e dere n’ asus Igbo.
Omumatu:
Ahiriokwu (Sentence)
Utoasusu (Grammer) dgz.
AJUJU:
1. Gini bu Akaraedemede?
2. Kpoputa Akaraedemede ise I maara.
3. Tinye Akaraedemede kwesiri ekwesiri n’ ahirokwu ndia.
i. Mgbada agu adaka enwe enyi na ozo na – ebi n’ ohia.
ii. Ahia mz okeke na aga nke oma.
AHUIKE NDI NTOROBIA
Ndi ntorobia bu ndi mmadu gafere n’ ogo umuaka, ha abughi ndi okenye. Ha no n’ agbata umuaka na ndi okenye.
Ndi ntorobia bu ndi isi ha na – acha oku. Ha bu ndi obara ha na – anu oku. Ha bu ndi guputara n’ ume ohuru na ndu ohuru. Ndi ntorobia bukwa ndi e ji igbasi ike na ikwudosi ike wee marana ndu. Ntorobia bu oge mmadu ejighi ama na a na – anwu anwu. Ndi ntorobia na – ahuta uwa a di ka ebe ihe uto n’ule di. Ha anaghi eji oge ahu ahu maobu mata ihe omimi, ihe oghom na kwa nhujuanya juputara n’ uwa. N’ ezie onye bie ndu ya nke oma n’ oge ntorobia, onye ahu ga agbanahu ihe odachi di iche iche na – adakwasa ndi ntorobia otutu ihe oghom na odachi ndi ahu na – adakwasa ha bukwa ihe ha ji aka ha wee kpatara onwe ha.
Ndi ntorobia na – eji maka ike juputara ha n’ ume nakwa ndu juputara ha n’ ahu niile were na – etinye aka na ndu ojoo di iche iche dika
1. inu anwuruike
2. ite ime
3. inubiga mmanya oke
4. izu ohi
5. igbu ochu
6. ilu ogu
7. inu ogwu agharaghara (Ogwu ike)
8. idina nwaanyi n’ ike
9. ibanye n’ otu nzuzo
10. ikwa iko dgz
Ihe oghom di iche iche na – esite na ndi ojoo ndi a adakwasa ndi ntorobia, site nay a oria di iche iche na – adakwasi ndi ntorobia, site nay a oria di iche iche na – adakwasa ndi ntorobia.
Ufodu oria ndi ahu gunyere:-
a. oria isimgbaka
b. oria HIV/AIDS
c. Nsi Nwaanyi (S T Ds)
d. Ukwaranta
e. Oria obimgbu
f. Oria metutara umeju
UZO DI ICHE ICHE ORIA SI ABATA N’ AHU NDI NTOROBIA
E nwere otutu uzo oria ndi a si abata n’ ahu ndi ntorobia dika.
1. Oria isimgbaka/ara:- Nke a bu oria ndi ntorobia na – enweta site n’ inu anwuru ike di ka ise Igbo, Ise kokeni, dgz.
2. Nsi Nwaanyi:- Nke a bu oria na – emetuta ndi ntorobia site na mmeko nwoke and nwaanyi (Ikwa iko).
3. Oria HIV/AIDs:- Otutu oge o bukwa site na mmeko nwoke na nwaanyi ka ndi ntorobia ji e nwete oria na – agbanyeghi na e nwere otutu ihe ndi ozo nwere ike ibute ya.
4. Ukwaranta:- Nke bu oria ndi ntorobia na – e nweta site n’ ise siga, inubiga mmanya oke na iri ihe obula ha huru dika nri.
5. Oria Obimgbu:- A na – e nwete ya site n’ inu ogwu agharaghara, o bukwa otu uzo ahu ka e si e nwete oria ndi metutara imeju.
UZO NDI NTOROBIA GA – ESI GBOCHI ORIA
Ndi Igbo si na mgbochi oria ka ogwugwo ya, n’ ihi nke a,
1. Ndi ntorobia ga – agba mbo gbochi oria ndia, ihe nke a putara buna ha ga – ewepu aka enwe n’ ofe tupu o ghoo aka mmadu.
2. Uzo di iche iche a ga esi mee nke a gungere ikwusi inu ogwu agharaghara, I ju inu anwuru ike dgz.
3. Ha ga – aju kpamkpam ihe o bula a kporo mmeko nwoke na nwaanyi maobu nwoke and nwoke maobu kwa nwaanyi na nwaanyi.
4. Ha ga – edebe onwe ha ocha mgbe niile ma debekwa gburugburu ha ocha.
Na nchikota, ndi ntorobia kwesiri I were onwe ha tinye n’ aka chukwu kpam kpam ka ha wee nwee ike I nweta ezigbo ndu na ihi na mmalite okorobia na agboghobia bu itu egwu chineke.
Anyi ga – ahu ihe bu ebumnauch oria mminwu ma oburu na anyiaguo abu a CHRISTAIN CHUKWU ANOZIE dere maka ya n’ akwukwo abu ya bu UCHE BU AKPA.
ORIA MMINWU
Aham bu oria mminwu
Aha otutu m bu echi eteka
Ana m amichapu mmadu obara
Onye m ji na – abu okporoko
Naani mkpuru anya ka m na – ahapu
Ka onye ahu hu ihe o mere onwe ya.
Abu m obirin’ajaocha
Anamghi m ezo onye m ji
Ebere adighi m n’ obi
Ogwu obula emeteghi m
Onwu bu ugwoonwa m
Ezinaulo m batara
Na – akuwa ka akwa okuko
Iwe na onuma na – adi
Uta m gaara mara esobe
Ihere agbaa ha gburugburu
E nwere, otutu ndi Ha na – agba m mgba okpuru
Ndi uka, igweokwu radio, tiivii, otutu akwukwo ogugu na okpu nnabuenyi.
Ha na – emebiri m ahia.
Onuogu ili ozu ebughizi ibu.
Agbogho yibenu mini
Okoro sogheribenu ha ka ijiji na – eso ogiri
Nwunye ukwu n’ ezi
Ndi di ledonu
Adezienu na adaziani anya, onu m ghere oghe.
Eji abu a na – ado ndi ntorobia aka n anti maka na oria mminwu e nweghi ogwu obula na – agwo ya.
AJUJU:
1. Kedu ndi bu ndi ntorobia?
2. Kpoputa oria ano na – emetuta ndi ntorobia.
3. Kowaputa ihe ato a ga – eme iji beleta oria ndia.
Unu ga – agu nootu ndi a nke oma, anyi bido, anyi akowaa ha nke oma ma mukwuoo ndi ozo.
Were akwukwo ogugu (text book) ji guo ndi ozo di na (scheme)