WEEK 2
IGBO LANGUAGE
KLASSI: JSS 2
ISIOKWU; NKWUWA NA NJUAJUJU
EBUMNUUCHE N’ISI NJEDEBE IHE OMUMU A, OTUTU UMU AKWUKWO NO NA KLAASI MGBE A KUZIRI ISIOKWU A GA- ENWE IKE
i. Kpoputa nkejiasusu ufodu na nkowa ya
ii. Gosiputa ha n’ ahiriokwu
iii. Iji ha mebe ahiriokwu
Nka nkuzi, ajuju nkowa, nrugozi, odide W.D.g
Nkowa nkwuwa
Nkwuwa bu nkejiasusu ma o bu mkpuruokwu na-akowa etu ihe siri mee. O bu okwu ngwaa ka o na-akowa
Omumaatu mkpuruokwu nkwuma
1. Ngwa ngwa
2. Unyaahu
3. Nwayo nwayo
4. Oso oso
5. Ike
6. Ozigbo
7. Nke oma
Omumaatu nkwuma
1. Ada ruru oru ya ngwa ngwa.
2. Mmiri zoro unyaahu.
3. Obi anaghi eje ozi oso oso.
4. O kwaturu ya n’ ike.
5. O puru ozigbo.
NJUAJUJU
Nkowa Ajuju
Njuajuju bu mkpuruokwu eji aju ajuju. Mkpuruokwu bu njuajuju gunyere:
1. Olia?
2. Kedu?
3. Anaa?
4. Ole?
5. Gini?
6. Ebee?
7. Onye?
8. Olee?
Omumaatu njuajuju N’ ahiriokwu
1. Kedu ka I mere?
2. Mmanya ahu a di anaa?
3. Gini mere m n’ ulo akwukwo taa?
4. Onye ke I bu?
5. Ole ka oche ahu di ?
Ajuju nuwala
1. Gini bu nkwuwa ?
2. Deputa mkpuruokwu ise bu nkwuwa.
3. Kowaa ihe njuajuju bu n’ otu ahiri okwu.
4. Deputa okwu ise bu njuajuju.
Ihe omume
Okwa : Denye nkwuwa ma o bu njuajuju dabara n’ ahiriokwu ndi a
1. …………. Ka unu bi ?
2. …………. Ihe m mere gi ?
3. Unu a di ……… na klaasi gi ?
4. O na-aga ije ……… ka ogwumaagala.
5. O riri nri ahu ………….