USORO IHE ỌMỤMỤ TAAM NKE ATỌ MAKA NDI SINỊỌ SEKỌNDỊRỊ NKE ABỤỌ
IZUKA |
ISIOKWU |
OTU |
Mmụgharị ihe e lere n’ule na team gara aga, idetu usoro ihe omume maka taam nke atọ. ulenta maka mmalite akwụkwọ taam nke atọ. |
ABUO |
Ụtọasụsụ - Iwu nsụpe - ịkanye akara ụdaolu ebe o kwesiri. Agụmagụ - Asụsụ nka – ilu. Omenala – Enwemenwe akụnụba - Nkọwa ihe enwemenwe bụ, enewemenwe dị icheiche. |
ATO |
Ụtọasụsụ - Ọgụgụ na aghọtaazaa – (a) Nlekọta gburugburu (i) Nkọwa gburugburu (ii) Nsogbu a na-enwegasị na gburugburu dịka : Ide mmiri, igbuta osisi agharaaghara. Agụmagụ - Asụsụ nka - ụkabụilu. Omenala – Usoro erimekpe na nnọchiọkwa. |
ANO |
Ụtọasụsụ - Ọgụgụ na aghọtaazaa – (i) ụzọ dị icheiche e si elekọta gburugburu (ii) uru dị n’ilekọta gburugburu (iii) oghọm dị n’elekọtaghị gburugburu. Agụmagụ - Edemede nka, ịkọwapụta edemede nka na ụdị ya: Akụkọ. Omenala - Ndịiche dị n’ iriekpe na ikeekpe. |
ISE |
Ụtọasụsụ - Ekwumekwu - Ikpochapụ ụbịam na agụụ, ihe na – ebute ụbịam na agụụ. Agụmagụ - Edemede nka, ịkọwapụta edemede nka na ụdị ya, Ejije. Omenala – Ndịiche dị n’erimekpe nnọchiọkwa na enwemenwe akamkpa. |
ISII |
Ụtọasụsụ - Ekwumekwu (i) ụzọ dị icheiche e si ekpọchapụ ụbịam na agụụ (ii) ụzọ a ga-esi gbochie ụbịam na agụụ - Agụmagụ - Edemede nka, ịkọwapụta edemede nka na ụdị ya - Abụ. omenala - Ntụlekọta enwemenwe obodo na obodo |
ASAA |
Ụtọasụsụ - Edemede – Usoro edemede ilu(i) mmalite dịka ihe ilu ahụ pụtara. Nkọwa ilu ahụ (ii) Ahụ edemede dịka : ịkọ otu ogologo akụkọ gosipụtara ilu ahụ (iii) mmechi edemede. Agụmagụ - Akụkọ na eserese ntọọchị. Omenala – Enwemenwe oge ugbua. |
ASATO |
Ụtọasụsụ - Edemede – Ide edemede ilu. Agụmagụ - Edemede nka – Njirimara edemede nka (a) echiche onye (b) edemede dabara n’ usoro (ch) asụsụ nka. Omenala – uru na ọghọm dị n’ịkpa akụ n’ ụzọ ezighị ezi. |
ITEGHITE |
Ụtọasụsụ - Edemede – Edemede nkọwami – usoro edemede nkọwami dịka – “nlenwoanya n’ihe gbasara mbamuru” (value re-orientation) (i) Okwu mmalite - mpụtara isiokwu (ii) Ahụ edemede, uche odee banyere isiokwu (iii) okwu mmechi nchịkọta echiche ode. Agụmagụ - Uru edemede nka bara. Omenala - Dịka ọ dị n’ izuuka nke asatọ.
|
IRI |
Ụtọasụsụ - Edemede – Ide edemede nkọwami. agụmagụ - odide edemede nka. Omenala – Mmemme dị icheiche.
|